PRAYER AFTER COMMUNION
ENGLISH VERSION:
Act of Faith
O Jesus, I believe that I have received your Flesh to eat and your Blood to drink, because you have said it, and your word is true, All that I have and all that I am are your gift and now you have given me yourself.
Act of Adoration
O Jesus, my God, my Creator, I adore you, because from your hands I came and with you I am to be happy for ever.
Act of Humility
O Jesus, I am not worthy to receive you, and yet you have come to me that may poor heart may learn of you to be meek and humble.
Act of Love
Jesus, I love you, I love you with all my heart. You know that I love you, and wish to love you daily more and more.
Act of Thanksgiving
My good Jesus, I thank you with all my heart. How good, how kind you are to me. Blessed be Jesus in the most holy Sacrament of the Altar.
IGBO VERSION:
Omume nke Okwukwe
O Jesu, ekwelum n'obim nine n'obu aru na nme gi kam natalu; makana Ngi kwulu n'ofu, n'okwu Gi bu eziokwu.
Omume nke Nsekpuru
O Jesu, Chukwu nke m, na Onye- okike nke m, esekpulu m Gi. N'aka Gi ka m si puta, maka onwe i azi ka I ji ke m, Ka m wenonyelu Gi n'anuli ebebe.
Omume nke Umeani
Jesu, ekwuputalu m na-abu m so aja na ntu ma gi bu Chukwu: I si n'enuigwe biakwute m n'enye m ike ikwunyelu Gi okwu nime obim.
Omume nke Ifunanya
Ezigbo Jesu afulu m Gi n'anya n'obi m nine, Gi amago na m fulu Ngi n'anya. Mee ka m fuwanye Gi n'anya nke odin'iru.
Inye-Ekene
Ezigbo Jesu, enye m Gi ekene n'obi m nine maka nnukwu afo-oma Gi ji n'aru m, Ngozi n'Eukaristia di aso.
Were Onwe gi Nye Jesu
O Jesu, ewelum onwem nye Gi dika Gi si welu onwe Gi nyem. Biko, nalu m, nala aru m, ka Gi do ya nso; nalu mkpulu obim ka I weruba ya na njo, nalu obim mee ka ofugide Gi n'anya. Ewelu m onwe m na mbosi nine nke ndu m, nye Gi, ka na ndu ka n'onwu ka mbulu nke Gi na ndu ebebe.
Ayiyo Maka Onwe Gi
O Jesu welu nme Gi di oke onu wuchapu njo m nine, Arapukwana m n'oge nlega, nye m grasia Gi ka wee diba ndu di nso, nw'uru onwu di nso weketa anuli ebebe.
Aririo Maka Ndi Ozo
O Jesu, nekwa Nzuko Gi di aso bu Nne anyi anya, Gozie Priest na ak- pachapuru mkpuru obim anya. Nekwasi-Nna m na Nne m na umunna m na ndi nile n'emere m afo oma anya. Gozie ha nile n' aru ma na mkpuru obi. Mere ndi ome njo ebere; zoputa ha n'oku-mmo. Ka mkpuru obi ndi nile kwerunu gara aga si n'ebere Gi wezuru ike na ndokwa. Ayo m Gi O Jesu duru m naba ka inyeru m aka irubelu ndi m no n'okpulu ha isi, nya n'idebe iwu Gi di aso ofuma ghara Idaba na njo ogbugbu. Oburu na m daba, nyelu m aka ka m si na njo weputa, nafuwanye Gi nanya, Amen.
Comments
Post a Comment
nubbystylesintl@gmail.com